Nehemiah 3

Ndị wugharịrị mgbidi ahụ

1Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ. 2Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko.

3Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. 4Meremot, nwa Ụraya, nwa Hakoz, rụziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Onye na-eso ya bụ Meshulam, nwa Berekaya, nwa Meshezabel, rụziri mgbidi, onye na-esota ya bụ Zadọk nwa Baana, onye rụzikwara mgbidi. 5Akụkụ nke ọzọ ka ndị ikom Tekoa rụziri, ma ndị ha a na-asọpụrụ ekweghị ehudata ubu ha nye ọrụ ahụ nʼokpuru ndị nlekọta ha.

6Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia wuru Ọnụ Ụzọ Ama Jeshana. Ha tinyere osisi ya niile, kwụba ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. 7Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis. 8Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara. 9Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem. 10Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia. 11Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ. 12Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ.

13Hanun duuru ndị obodo Zanoa wuo Ọnụ Ụzọ Ndagwurugwu. Ha wuziri ya, tinye ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. Ha wuzikwara mpaghara ahụ nke ịdị ogologo ya ruru narị mita ise, ruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.

14Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.

15Shalum nwa Kol-Hoze, onyeisi ọchịchị ala dị Mizpa gburugburu, wuziri ọnụ ụzọ ama isi iyi, kpuchie elu ya, tinye ya ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. O mezikwara mgbidi ahụ site nʼọdọ mmiri Siloam ruo nʼubi eze a gbara ogige, na ruokwa na nkwasa nrịda dị site nʼobodo Devid ma e site Jerusalem na-apụta. 16Onye na-eso ya bụ Nehemaya nwa Azbuk, onyeisi ọchịchị ọkara nʼime Bet Zoa.
Bụ ụlọ obibi ochie ndị nche, nke Devid wuru maka ndị agha na-eche ya nche mgbe ọ bụ eze. 2Sa 23:8-39
O wuziri mgbidi ahụ ruo ncherita ihu ebe ili Devid, ruokwa ọdọ ebe emere maka ichekọta mmiri, na nʼỤlọ ndị Dike nʼagha.

Ọrụ ndị Livayị rụrụ

17Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya. 18Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara. 19Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya. 20Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja. 21Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya.

Ọrụ ndị nchụaja rụrụ

22Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya. 23Isonye ha, Benjamin na Hashub wuziri akụkụ ahụ dị nʼihu ụlọ ha. Azaraya nwa Maaseia, onye bụkwa nwa nwa Ananaya wuziri nke na-esote ya, nke dịkwa nʼakụkụ ụlọ ya. 24Binui nwa Henadad wuziri akụkụ nke ọzọ, nke sitere nʼihu ụlọ Azaraya ruo na nkuku mgbidi ahụ. 25Palal nwa Uzai wuziri akụkụ nke na-eso ya site na nkuku mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu dị nʼakụkụ elu elu ụlọeze nʼebe dị nso nʼogige ndị nche. Nke so ya bụ Pedaia nwa Parosh, 26na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ahụ bụ ndị bi nʼelu ugwu Ofel, wuziri akụkụ nke na-esote ruo nʼebe dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, ruokwa nʼụlọ elu nche nke ụlọ ukwu ahụ. 27Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.

28Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya. 29Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota. 30Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya. 31Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ. 32Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụchara ọrụ iwuzi akụkụ mgbidi nke fọdụrụ, site nʼetiti ọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ.

Copyright information for IboBIU